Now Reading
Ntụgharị Ịkwụ Ọtọ: Ma Ọ Bụ Ihe Mere Mmadụ Ji Akwụ Ọtọ Aga Ije

Ntụgharị Ịkwụ Ọtọ: Ma Ọ Bụ Ihe Mere Mmadụ Ji Akwụ Ọtọ Aga Ije

The Upright Revolution 4


Igbo

Nzube Ifechukwu

N’oge tere aka gara aga mmadụ ji ụkwụ na aka aga ije, dị ka ụmụ anụ ndị ọzọ nwere ụkwụ anọ. Mmadụ ka edi, agụ ma ọ bụ rino agasi ike. Ụkwụ na aka ka dị onwe ha nso karịa akụkụ ahụ ndị ọzọ: ha nwere myiri njikọ ọkpụkpụ: ubu na ukwu; nku aka na ikpere ụkwụ; nkwonkwo ụkwụ na nkwonkwo aka; obo ọkpa na obo aka, ebe nke ọ bụla nwere mkpịsị ụkwụ na mkpịsị aka ise, na mvọ na mkpịsị ụkwụ na aka ọ bụla. Obo aka na obo ọkpa nwere myiri mkpịsị ụkwụ na mkpịsị aka ise malite n’isi ụkwụ na isi aka ruo na nnwa ụkwụ na nnwa aka. N’oge ahụ isi aka dị mkpịsị aka ndị ọzọ nso, otu isi ụkwụ si dị mkpịsị ụkwụ ndị ọzọ nso. Ụkwụ na aka na-akpọ onwe ha ụmụnne.

Ha na-enyere onwe ha aka na-ebu ahụ eje ebe ọ bụla ọ masịrị ya ije; ahịa, ụlọ ahịa, mgbago na mgbada ukwu osisi na ugwu, ebe ọ bụla kwesịrị ngagharị. Ma n’ime mmiri, ha na-arụkọ ọrụ ọnụ nke ọma inyere ahụ aka ka o see n’elu mmiri, gwuo mmiri ma ọ bụ maba n’ime mmiri. Ha gbakọrọ aka ọnụ, hara nha, na mmekọrịta ha. Ha nwekwara ike ịrịọrọ uru akụkụ ahụ ndị ọzọ, dị ka mkpọtụ n’aka ọnụ, anụmihe n’aka ntị, isi n’aka imi, tụmadị ịhụ ụzọ n’aka anya.

Mmekọrịta ha enweghị atụ mere akụkụ ahụ ndị ọzọ enwewe ntaji anya. O wutere ha ịrịọsị ụmụnne a uru ha dịgasị iche iche. Ntaji anya mechiri ha anya nke na ha ahụghị n’ụkwụ na aka bu ha eje ebe dị iche iche. Ha bidoro kpawa nkata megide ihe abụọ abụọ ndị a.

Ire rịọrọ ụbụrụ uche ma tinye ya n’ọrụ ngwa ngwa. O bidoro iche, na-ekwuputakwa echiche a, banyere ike aka na ụkwụ. O chere, onye ka ike. Ụmụnne abụọ, ndị ọ dịghịbụ echu ụra ihe ibe ha nwere ma ọ bụ nwere ike ime, bịazịrị rịọrọ ọnụ mkpọtụ wee bido sịwa na ha ka mkpa n’ahụ karịa ibe ha. Nke a eteghị aka tupu ọ bụrụzia onye ka mma ka a na-azọ; aka turu ọnụ banyere ogologo mkpịsị aka tara ahụ n’ụzọ mara mma nke obo aka, ebe ọ kọtọkwara mkpịsị ụkwụ maka ịdị mkpụmkpụ na ntinti. Apụụ kọgbuo ha, mkpịsị ụkwụ kwughasịrị ihe aka kwuru ma kwuo na nkọtọ maka mkpịsị aka tara ahụ, ụmụnne agụụ na-egbu! Nke a dị otu a ọtụtụ ụbọchị, mgbe ụfọdụ ọ na-eme na ha anaghị arụkọzị ọrụ ọnụ nke ọma otu ha kwesịrị. N’ikpeazụ ọ bụzị onye ka ike ka a na-ajụ; ha jekwuuru akụkụ ahụ ndị ọzọ ka ha kpee nke a.

Ọ bụ Ire tụrụ atụmatụ ka a maa aka. Onye ọ bụla kwekọrịtara na ọ bụ atụmatụ ọma. Mana gịnị? Ụfọdụ tụrụ atụmatụ ka a gbaa mgba – ụkwụ na aka gbaa mgba. Ndị ọzọ sịrị ka ha kụọ mma, tụọ oroma, gbaa ọsọ, ma ọ bụ gwuo egwuregwu dị ka cheesị ma ọ bụ chekaasị mana a katọrọ egwuregwu nke ọ bụla sị na o siri ike ime ma ọ bụ na o megidere otu n’ime aka ma ọ bụ ụkwụ. Ọ bụkwazị Ire, mgbe ọ rịọtara ụbụrụ uche, gboro nsogbu a n’ụzọ dị mfe. Otu n’ime aka na ụkwụ ga-ama ibe ha aka, n’otu n’otu. Aka na ụkwụ kwekọrịta.

A mara aka a n’ebe a sụchara asụcha n’ime ọhịa, dị otu mmiri nso. Akụkụ ahụ niile kere nkwụcha maka ihe egwu ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla nwere ike ime ahụ na-atụghị anya, ugbua akụkụ ahụ ya na-asọ mpi n’ime onwe ha. Anya lee ebe dị anya, o lee ebe dị nso maka ihe egwu dịkarịsịrị nta si akụkụ ọ bụla abịa; ntị jikeere onwe ha ịnụ mkpọtụ dịkarịsịrị nta si akụkụ ọ bụla abịa; imi hụchasịrị oghere ya nke ọma ịnụ isi ihe egwu ọ bụla nke anya ahụghị ma ọ bụ ntị anụghị; ire dịkwa njikere iti mkpu ike, ihe egwu.

Ifufe fesara ihe akụkọ ịma aka a n’akụkụ anọ ọhịa, mmiri na ikuku. Ụmụ anụ ndị nwere ụkwụ anọ so na ndị mbụ gbakọrọ, ọtụtụ n’ime ha ndị buru ibu ji anaka akwụkwọ ndụ iji gosi na ha bịara n’udo. Ọ bụ igwe mara mma nke Agụ, Ọdụm, Edi, Enyi, Ene, Ehi nwere ogologo mpi, Ehi nwere obere mpi, Mgbada na Oke. Anụ ndị bi na mmiri, Azụ, Agụ-iyi, gbasara elu ha n’ikpere mmiri, hapụ akụkụ ahụ ha ndị ọzọ na mmiri. Ndị nwere ụkwụ abụọ fere nku ha kpaka kpaka n’ọñụ; ụmụ nnụnụ nọ n’ukwu osisi agụ egwu; Nte nọkwa n’abụ oge niile. Udido, Idide, Esu na-akpụgharị n’ala ma ọ bụ n’ukwu osisi. Ogwumagala ji nwaayọ nwaayọ na-azọpụ ije ebe Ngwere na-agbagharị, ịnọ otu ebe ekweghị ya. Enwe, Adaka, na-amagharị n’anaka osisi. Tụmadị osisi na ọhịa fegharịrị nwaayọ nwaayọ n’akụkụ ọ bụla, hulata, bịa nọdụ otu ebe n’otu n’otu.

Ọnụ ji abụ wee mepee ịma aka a:

Anyị na-eme nke a ka obi wee dị anyị mma
Anyị na-eme nke a ka obi wee dị anyị mma
Anyị na-eme nke a ka obi wee dị anyị mma
Maka anyị niile
Si n’otu chi.

Aka na ụkwụ ñụrụ iyi na ha ga-anabata ihe ọ bụla ọ pụtara n’obi ọcha; o nweghị onye ga-ewe iwe, jụ ọrụ ma ọ bụ ghara ịrụsizi ọrụ ike otu o kwesịrị.

Aka bu uzo ma ụkwụ aka: ha tụpụrụ mpekere osisi n’ala. Ụkwụ, nke ekpe ma ọ bụ nke nri, ma ọ bụ ha abụọ n’otu, ga-ewelite mpekere osisi dị n’ala ma maa ya. Ụkwụ abụọ nwere ike ịgba izu, mgbe ọ bụla n’oge ịma aka a, nwekwaa ike iji mkpịsị ụkwụ, n’otu n’otu ma ọ bụ ha niile, n’ụzọ ọ bụla iji nweta ihe ha chọrọ. Ha gbalịrị ịtụgharị mpekere osisi; ịkwa ya; ha gbalịrị n’ụzọ dị iche iche ma ha enweghị ike iwelite ya nke ọma: gbasara ịkwagharị ya, naanị ihe ha nwere ike ime bụ ịgbapụ ya ntakịrị. Mgbe ha hụrụ nke a, mkpịsị aka rịọtara ọnụ mkpọtụ wee mụọ oke amụ. Aka, ndị mara aka, na-agagharị, ka ana-ama aka onye ka mma, na-egosi onwe ha tara ahụ n’ụzọ mara mma, bịazie welite mpekere osisi a n’ụzọ dị iche iche. Ha tutere ya aka n’ime ọhịa, nke mere ka ma ndị nkiri ma ndị ha mara aka zituo ume na mmasị. Ha zikwara ihe ndị ọzọ ha nwere ike ime: ha wepụrụ mpekere aja n’ọkwa osikapa; ha ganyere owu na ntụtụ; ha rụrụ ọbere ụdọ nta iji adọli osisi ndị buru ibu; ha pịrị ube ole ma ole tutee ya aka, ihe ndị mkpịsị ụkwụ nwere ike ịrọ naanị na nrọ. Ụkwụ nọ ala ebe ahụ bụrụ naanị anya n’ihe ụmụnne ya tara ahụ nwere ike ime. Aka ndị nkiri kụrụ egbe igwe na mmasị na nkwado aka ibe ha, nke kpasuru ụkwụ iwe nke ukwuu. Mana ha adịghị njikere ikwete mmeri: ka ha nọ ka ndị nọ n’ọbere mwute, isi ụkwụ ha na-ese ihe okirikiri n’aja, ha na-achọ ihe ọmụma aka ga-enye ha mmeri.

N’ikpeazụ, ọ bụ ụkwụ na mkpịsị ụkwụ ka o ruru iwepụta ihe ọmụma aka. Nke ha, ha kwuru, dị mfe. Aka buru ahụ niile site n’otu akụkụ ama buje n’akụkụ ọzọ. Mkpịsị aka chere na ngala, kedu ụdị ọmụma aka ndị enweghị uche bụ nke a. Ọ bụ ihe nkiri dị mma nlele. Ihe niile gbasara ahụ tụgharịrị atụgharị. Aka metụrụ ala; anya dị ala nso, ha enwekwaghị ike ịhụ ụzọ nke ọma maka ha dị ala nso; izuzu bara imi, mee ya ọ na-eti uzere; ụkwụ na mkpịsị ụkwụ ko n’elu: ndị nkiri tiri mkpu, nyayo juu, kwewe ukwe n’egwu.

Elu anyị na ụkwụ
O nweghịkwa ihe anyị na-eche
Elu anyị na ụkwụ
So ụkwụ
Ka anyị fee n’igwe

Mana anya ha dị n’ebe obo aka na aka nọ. Akụkụ ahụ na-eme ihe ire dị egwu naanị nkeji ole ma ole gara aga, enwekwaghị ike imegharị. Ka ha gara nwantakịrị, obo aka bere akwa ụfụ, aka niile mara jijiji, nọdụ otu ebe, tupu ha ahapụ ahụ ka ọ daa. Ha zuru ike ma nwalee ọzọ. Ugbua ha gbara mbọ ịgbasasị mkpịsị aka nke ọma iji jide ala ma naanị isi aka nwere ike ịgbasa. Ha chọrọ ịga ije agụ mana akagburu ije a n’ihi na ha enweghị ike ịga ya naanị ha ma e wezuga ụkwụ. Ọ bụ mkpịsị ụkwụ ka o ruru ịmụ amụ ugbua. Ha rịọtara ọnụ onu na-asụ asụ iji wee nwee ihe dị iche n’amụ ha na onu ọkwa mkpịsị aka ji mụ. Mgbe ha nụrụ ịkwa emo nke a, aka were oke iwe bịa gbakwuo mbọ otu ugboro ibu ahụ. Ha enweghị ike ịzọpụ otu aka. Mgbe ike gwụrụ ha obo aka na mkpịsị aka kwetere na ọ gaghị ekwe ha me. Obi dị ụkwụ ụtọ igosipụta ihe ha nwere ike ime: ha kwadoro, gbaa mwe mwe ọsọ, gbasie ọsọ ike, wụọ ebe dị elu, wụọ ebe dị anya, na-ekweghị ka ahụ daa ọ bụladị otu mgbe. Ụkwụ ndị nkiri niile zọsiri ike n’ala na nkwado. Aka weliri obo aka ha elu iji kpesa n’ihe a apụkwaala n’egwu, ma chefuo na ọ bụ ha malitere ya bụ egwu.

Ma ha niile, tụmadị ndị nkiri, chọpụtara ihe mgbanwe banyere aka: isi aka ndị nke gbasara mgbe obo aka na-agbalị ibu ahụ, anọghịzịkwa mkpịsị aka ndị ọzọ nso. Akụkụ ahụ ndị ha na aka na-adọ ndọrọndọrọ a chọrọ ịmalite ọchị ha mgbe ha chọpụtakwara ihe ọzọ; kama mgbasa isi aka ndị a gbasara ime ka obo aka ghara ịrụzị ọrụ ya nke ọma, o mere ha enwee ike ijisikwu ihe ike. Gịnị bụ nke a? Ọrụsị gbanwere bụrụzịa ike mmepụta!

Ñgọ akụkụ ahụ niile siri iji kwekọrịta onye meriri ruru ụbọchị ise, ọnụọgụgụ mkpịsị aka na mkpịsị ụkwụ dị n’aka ma ọ bụ n’ụkwụ ọ bụla. Agbanyeghị ole ha si gbaka mbọ ha enweghị ike ikwu hoo-haa onye meriri; aka na ụkwụ bụcha ọka ibe n’ihe ha makarịsịrị eme; o nweghị nke pụrụ ime ma e wezuga ibe ha. Ha bidoro itule uche: ha niile jụrụ, gịnị bụ ahụ, ha abịa chọpụta n’ahụ bụ ha niile dum; ha nọ n’ime onwe ha. Akụkụ ahụ ọ bụla kwesịrị ịna-arụ ọrụ nke ọma tupu akụkụ ahụ niile arụwa ọrụ nke ọma.

Mana ka e wee gbochie nsogbu dị otu a n’ọdịniihu na ka e wee gbochie aka na ụkwụ ise okwu ọzọ, akụkụ ahụ niile kpebiri na bido oge ahụ n’ahụ ga-akwụzị ọtọ aga ije, ụkwụ akwụsie ike n’ala, aka adị n’elu n’ikuku. Obi dị ahụ ụtọ na mkpebi a mana ọ ga-ahapụ ụmụaka ka ha jiri aka na ụkwụ gaa ije ka ha wee ghara ichezọ mbido ha. Ha kere ọrụ eke: ụkwụ ga-ebu ahụ mana ngwa ngwa ha ruru ebe a na-eje, aka ga-arụ ọrụ chọrọ mmepụta ma ọ bụ ijide ngwa ọrụ. Ebe ụkwụ na obo ọkpa na-arụ ọrụ dị ike nke obubu, aka setịpụrụ jiri aka ọrụ ha na-arụ okirikiri ahụ, na-ahụ na nri ruru ọnụ. Ọnụ, mba, ọ bụ eze, ga-ata ya, lodaa ya n’afọ site n’akpịrị. Afọ ga-apịchapụta ihe ọma ya niile bịa wụnye ya n’ime ọwara dịgasị iche iche ebe ihe ọma a ga-esi gbasasị n’akụkụ ahụ niile. Afọ ga-abịazị weje ihe ndị a e tinyegoo n’ọrụ n’akụkụ ahụ ndị na-ahụ maka ikpochapụ ihe ndị a, ebe ahụ ga-esi nyụpụ ya n’ala gba ọtọ ma ọ bụ lie ya n’ime aja. Ukwu osisi ga-eto mịa mkpụrụ; aka ga-aghọrọ ụfọdụ ma tụnye ya ọnụ. Ee, okiriki nke ndụ.

E kere ma egwuregwu ma ihe mkparị amụ eke otu o kwesịrị: a hapụụrụ ọnụ ịgụ egwu, ịmụ amụ na ikwu okwu; a hapụụrụ ụkwụ ịgba ọsọ na egwuregwu bọọlụ n’ebe ọ dị ukwuu; ebe e debeere aka egwuregwu ịkụ bọọlụ na ịtụ bọọlụ, e wezuga n’ụkwụ ga-agba ọsọ e kwesịrị ịgba. N’egwuregwu ịgba ọsọ na ịwụ elu, a chaara ụkwụ ọgbọ, n’ebe ọ dị ukwuu. Okike ọrụ nke a doro anya mere ahụ mmadụ ọ bụrụ ngwa ọrụ na-eku ume bụ a kwaa akwụrụ, karịa ọ bụlagodi anụ bukarịsịrị n’ihe o nwere ike imepụta ma n’ọnụọgụgụ ma n’ịbụ gem.

Mana akụkụ ahụ niile chọpụtara n’ụdị ọnọdụ a ha kwekọrịtara ka nwere ike ibute ọgbaghara. Isi ịnọ n’elu ebe ahụ nwere ike ime ya o chewe na ọ ka ụkwụ na-emetụ ala mma ma ọ bụ na ọ bụ nna ukwu ebe akụkụ ahụ ndị nọ ya n’okpuru bụ naanị ụmụ odibo. Ha mere ka o wee anya na n’ebe ike dị, isi na ihe ọ bụla nọ ya n’okpuru ha nha anya. Iji gosi ka nke a si dịka mkpa, akụkụ ahụ hụrụ n’ụfụ na ọñụ nke otu n’ime ha metụtara ha dum. Ha dọrọ ọnụ aka na ntị na mgbe ọ na-ekwu nke mụ a na nke mụ ọzọ, na ọ na-ekwu nke a dị ka ahụ niile, ọ bụghị dị ka ọ bụ naanị ya nwe.

Ha gụrụ egwu:

N’ahụ anyị
Enweghịkwa odibo ọ bụla
N’ahụ anyị
Enweghịkwa odibo ọ bụla
Anyị na-efe onwe anyị
Anyị maka Anyị
Anyị na-efe onwe anyị
Anyị maka Anyị
Anyị na-efe onwe anyị
Ire onu anyị
I jide m ejide m gị
Anyị arụọ ahụ gbasiri ike
I jide m ejide m gị
Anyị arụọ ahụ gbasiri ike
Mma bụ ịdị n’otu

Anyị ga-agbakọ aka rụọ ọrụ
Maka ahụ gbasiri ike
Anyị ga-agbakọ aka rụọ ọrụ
Maka ahụ gbasiri ike
Ịdị n’otu bụ ike anyị

Nke a abụrụ Abụ nke Ahụ Niile. Ahụ ka na-ekwe ya ruo taa, ọ bụ nke a na-ekwu ihe dị iche n’etiti mmadụ na anụmanụ, ma ọ bụ ndị jụrụ ntụgharị ịkwụ ọtọ.

Agbanyeghị ihe ha hụrụ, ụmụ anụ nwere ụkwụ anọ agaghị enwe ntụgharị a. Nke ịgụ egwu kpara ha ọchị. Ọnụ bụ iri nri ka e mebere ya, ọ bụghị ịgụ egwu. Ha wubere otu ndị ọdịnaala achọghị mgbanwe ma kwụdosie ike n’ụzọ ha jụ mmegharị.

Mgbe ụmụ mmadụ na-amụta ihe site na ngalaba akụkụ ahụ ha niile, ha na-eme nke ọma; ma mgbe ha hụrụ ahụ na isi ka otu abụọ nọ n’agha, otu n’elu nke ọzọ, ha na-adị ka ụmụnne ha ụmụ anụmanụ ndị nke jụrụ ntụgharị ịkwụ ọtọ.

~
Edited by Dr. Nkem Ekene Osuigwe
Read the English translation – The Upright Revolution: Or Why Humans Walk Upright by Ngugi wa Thiong’o


Nzube Ifechukwu was born on May 25, 1992 in Onitsha, Nigeria. He studies electrical engineering at the University of Nigeria, Nsukka. He has been published in the Sunday Sun (Nigeria) and on Sentinel Nigeria, amongst others.

What's Your Reaction?
Excited
0
Happy
0
In Love
0
Not Sure
0
Silly
0
Scroll To Top

Discover more from Jalada Africa

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading