Ya bu na-eji m obo okpa m gwepia mkpuruobi gi?
Ha! Akpowara m obi gi wuputa mkpuruobi gi?
O’ na-obughi gi wupuru ya bu ola esighi ike n’uzo m,
n’ebe ahu obo okpa m kwesiri izosa?
Koro mkpuruobi gi gwepiara egwepia, ezigbo; jisie ya ike.
Oso,
Tupu onye ije ozo azokpunyekwuo ya
N’ime ime aja
Ebe o gaghi ekwezi nkoputa.
So I made your heart squelch under my sole?
Ha! Did I split your chest to spill your heart?
Was it not you who flung such a frail pearl on my road,
at the very spot my suspended sole was to step?
Scoop up the pulp, dear; clasp it tightly.
Quickly,
before the next traveller tramples it
deep deep into the dune
beyond scooping.

